-
Joshụa 22:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Mosis nyere ọkara ebo Manase ala na Beshan,+ Joshụa enyekwa ọkara nke ọzọ, bụ́ ụmụnne ha, ala n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan.+ Joshụa gọzikwara ha mgbe ọ gwara ha ka ha laghachi n’ụlọikwuu ha. 8 Ọ gwakwara ha, sị: “Jirinụ ọtụtụ akụ̀, ọtụtụ anụmanụ, ọlaọcha na ọlaedo, ọla kọpa na ígwè, nakwa ọtụtụ uwe laghachi n’ụlọikwuu unu.+ Werenụ ihe ndị unu kwatara+ n’aka ndị iro unu gaa ka unu na ụmụnne unu kee ha.”
-