-
Ọnụ Ọgụgụ 27:1-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ụmụ nwaanyị Zelofehad+ wee bịa. Zelofehad bụ nwa Hifa, nwa Gilied, nwa Mekia, nwa Manase, onye si n’ezinụlọ ndị si n’ebo Manase nwa Josef. Aha ụmụ nwaanyị ọ mụtara bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza. 2 Ha bịara guzo n’ihu Mosis, Elieza onye nchụàjà, ndị isi,+ nakwa n’ihu nzukọ niile ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, sị: 3 “Nna anyị nwụrụ n’ala ịkpa, ma o soghị ná ndị kwadoro Kora,+ bụ́ ndị zukọtara maa Jehova aka. Kama ọ nwụrụ n’ihi mmehie nke ya. Ọ mụtaghị nwa nwoke. 4 Gịnị mere aha nna anyị ga-eji fuo n’ezinụlọ ya maka na ọ mụtaghị nwa nwoke? Kenye anyị ala otú e kenyere ụmụnne nna anyị.” 5 Mosis wee kọsara Jehova ihe ha kwuru.+
6 Jehova gwaziri Mosis, sị: 7 “Ihe ụmụ Zelofehad kwuru bụ eziokwu. Hụ na i kenyere ha ala otú e kenyere ụmụnne nna ha. Ị ga-enyefekwa ha ala nna ha kwesịrị iketa.+
-