16 Kora+ nwa Izha,+ nwa Kohat,+ nwa Livaị,+ ya na Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab,+ nakwa Ọn nwa Pilet, bụ́ ụmụ Ruben,+ wee zukọta. 2 Ha malitere ịma Mosis aka, ha na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) ndị Izrel, bụ́ ndị isi nzukọ ahụ, ndị e si n’ọgbakọ ahụ họrọ, ụmụ nwoke a ma ama.