-
Ọnụ Ọgụgụ 3:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ọrụ ụmụ Geshọn+ n’ụlọikwuu nzute bụ ilekọta ụlọikwuu ahụ na ákwà ya,+ ihe e ji kpuchie ya,+ ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu nzute, 26 ákwà mgbochi+ ndị dị n’ogige ya, ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ ogige ya nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà gburugburu, ụdọ ndị e ji ejide ákwà ụlọikwuu ya, na ọrụ niile gbasara ihe ndị a.
-