-
Ọnụ Ọgụgụ 4:24-26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Ihe a bụ ọrụ e kenyere ezinụlọ ụmụ Geshọn ka ha na-arụ na ibu e kenyere ha ka ha na-ebu.+ 25 Ha ga na-ebu ákwà ụlọikwuu ahụ,+ ụlọikwuu nzute, ihe e ji kpuchie ya na ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee e ji kpuchie ya,+ ákwà ngebichi* nke dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu nzute,+ 26 na ákwà mgbochi ndị dị n’ogige ya,+ na ákwà ngebichi* dị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ+ nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ahụ gburugburu, na ụdọ ndị e ji ejide ákwà ụlọikwuu ya na arịa ha niile na ihe niile e ji arụ ọrụ gbasara ya. Ọ bụ ihe a bụ ọrụ ha.
-