17 n’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe nakwa ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Nwa* gị ga-ewegharakwa obodo* ndị iro ya.+
26 Nwoke ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, nyere ọkara shekel, nke bụ́ ọkara shekel ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.+ Ụmụ nwoke ndị ahụ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+
32 Ọ bụ ndị a bụ ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara ha. Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị bi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+