12Miriam na Erọn malitere ikwujọ Mosis n’ihi nwaanyị onye Kush ọ lụrụ, maka na nwaanyị ọ lụrụ bụ onye Kush.+2 Ha nọ na-asị: “Ọ̀ bụ naanị Mosis ka Jehova sirila n’ọnụ ya kwuo okwu? Ó sibeghịkwa n’ọnụ anyị kwuo okwu?”+ Jehova nọkwa na-ege ntị.+
2 Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a.