51 Mgbe ọ bụla a ga-eburu ụlọikwuu ahụ gaa n’ebe ọzọ, ọ bụ ndị Livaị ga-atọtu ya.+ Mgbe ọ bụla a ga-akwụwa ụlọikwuu ahụ, ọ bụ ndị Livaị ga-akwụwa ya. Onye ọ bụla na-abụghị onye Livaị* bịara nso, a ga-egbu ya.+
4 Ha ga-esoro gị na-arụ ọrụ niile gbasara ụlọikwuu nzute, na-ejekwa ozi niile ha kwesịrị ije n’ụlọikwuu. Onye na-abụghị onye nchụàjà* agaghị abịa unu nso.+
7 Ọ bụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ga na-arụ ọrụ nchụàjà n’ebe ịchụàjà nakwa n’ime ebe ahụ e gebichiri ákwà mgbochi.+ Ọ bụ unu ga na-eje ozi a.+ Enyela m unu ọrụ nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye m nyere unu. Onye ọ bụla na-abụghị onye nchụàjà* bịara nso, a ga-egbu ya.”+