-
Levitikọs 5:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie ya. Ọ gaghị awụ mmanụ n’elu ya ma ọ bụ tụkwasị frankinsens n’elu ya n’ihi na ọ bụ àjà mmehie. 12 Ọ ga-ewetara ya onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà o wetara, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà Jehova e suru ọkụ. Ọ bụ àjà mmehie.
-
-
Levitikọs 6:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà mmehie:+ Ọ bụ n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ+ ka a ga-egbukwa anụ e ji achụ àjà mmehie n’ihu Jehova. Ọ bụ ihe kacha nsọ. 26 Onye nchụàjà nke chụrụ ya n’àjà maka mmehie ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya, n’ogige ụlọikwuu nzute.+
-