15 E duhiela ha n’ihi na ha hapụrụ ezigbo ụzọ. Ha esorola ụzọ Belam+ nwa Biọ, onye mere ihe ọjọọ maka na obi ya dị nnọọ n’ụgwọ a ga-akwụ ya.+ 16 A baara ya mba maka ihe ọjọọ o mere.+ Jakị na-anaghị ekwu okwu kwuru okwu otú mmadụ si ekwu iji gbochie onye amụma ahụ ime ka onye nzuzu.+