28“Ị ga-esi ná ndị Izrel kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị nwoke, ka ha bụrụ ndị nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ ya na Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.+
2 “Kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke,+ chịrị uwe ha,+ were mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ,+ kpụrụ oké ehi e ji achụ àjà mmehie na ebule abụọ, burukwa nkata nke achịcha na-ekoghị eko dị na ya+3 ma kpọkọta nzukọ Izrel niile ka ha gbakọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.”