12 “Mgbe ọ bụla ị gụrụ ụmụ nwoke Izrel ọnụ ka ị mata ole ha dị,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Jehova ihe ọ ga-eji gbara ndụ* ya mgbe a na-agụ ha ọnụ, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime ha mgbe a na-edeba aha ha n’akwụkwọ.
26 Nwoke ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, nyere ọkara shekel, nke bụ́ ọkara shekel ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.+ Ụmụ nwoke ndị ahụ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+