15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
48 Jehova ga-eme ka ndị iro unu bịa lụso unu agha, unu ga-ejekwara ha ozi.+ N’oge ahụ, agụụ ga na-agụ unu,+ mmiri ga na-agụkwa unu, unu agaghị eyi ezigbo ákwà, ihe niile ga-akọkwa unu. Ọ ga-anyawa unu yok ígwè n’olu ruo mgbe ọ lara unu n’iyi.
14 Jehova wee wesa Izrel ezigbo iwe. O nyefere ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe, ha wee na-akwakọrọ ihe ha.+ O nyefere ha n’aka* ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+
28 “Ma ozugbo ha nweere onwe ha, ha na-ebidokwa mewe ihe na-adịghị gị mma.+ Ị na-ahapụ ha ka ndị iro ha kpara ha aka, ha na-emegbukwa ha.*+ Ha na-alọghachi kpọkuo gị ka i nyere ha aka.+ Ị na-anọ n’eluigwe nụ ma napụta ha ugboro ugboro n’ihi ebere gị nke dị ukwuu.+