8 Manoa rịọrọ Jehova, sị: “Ewela iwe, Jehova. Biko, ka onye nke ezi Chineke i zitere bịaghachi gwa anyị ihe anyị kwesịrị ime nwa ahụ a ga-amụ.” 9 Ezi Chineke wee gee Manoa ntị. Mmụọ ozi nke ezi Chineke bịakwutere nwaanyị ahụ ọzọ mgbe ọ nọ ọdụ n’ubi. Manoa di ya esoghị ya nọrọ n’ebe ahụ.