-
Jenesis 19:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ndị mmụọ ozi abụọ ahụ rutere Sọdọm ná mgbede. N’oge ahụ, Lọt nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá Sọdọm. Mgbe Lọt hụrụ ha, o biliri gaa izute ha, ọ kpọkwara isiala.+ 2 Ọ sịrị ha: “Ndị nwe m, biko, batanụ n’ụlọ ohu unu, nọrọkwanụ ruo mgbe chi bọrọ, ka a saakwa unu ụkwụ, echi unu ebilie n’isi ụtụtụ gawa ebe unu na-aga.” Ha wee sị: “Mba, anyị ga-arahụ n’ámá obodo.” 3 Ma ọ rịọsiri ha arịrịọ ike, ha esorozie ya banye n’ụlọ ya. O wee siere ha ezigbo nri, meekwa achịcha na-ekoghị eko, ha erie.
-