17 Ma ha ekweghịdị ege ndị ikpe ahụ ntị, kama ha kpara àgwà ka ndị akwụna hapụ Chineke gaa na-efe chi dị iche iche, na-akpọkwara ha isiala. N’egbughị oge, ha hapụrụ ibi ndụ otú ndị nna nna ha si bie ndụ, bụ́ ndị rubeere iwu Jehova isi.+ Ha emeghị ka ha.
19 Ma mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-ebidokwa kpawa àgwà ọjọọ karịa ndị nna nna ha, na-efe chi dị iche iche ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na isi ike ha.
6 Ndị Izrel malitere ọzọ ime ihe dị njọ n’anya Jehova.+ Ha malitekwara ife Bel,+ Ashtọret, chi ndị Eram,* chi ndị Saịdọn, chi ndị Moab,+ chi ndị Amọn,+ na chi ndị Filistia.+ Ha hapụrụ Jehova, ha efeghịkwa ya.