-
Aịzaya 44:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 E nweghị onye na-eche echiche.
E nweghịkwa onye ma ihe ma ọ bụ onye na-aghọta ihe, nke na-asị:
“Etinyere m ọkara osisi ahụ ọkụ,
Jiri icheku ọkụ ya mee achịcha, jirikwa ya hụọ anụ m tara.
M̀ kwesịrị iji nke fọrọ afọ pịa ihe rụrụ arụ?+
M̀ kwesịrị ife mkpirisi osisi?”
20 Ọ dị ka onye na-aracha ntụ.
Obi ya duhiere ya maka na a ghọgburu ya.
O nweghị ike ịzọpụta onwe ya.* Ọ naghịkwanụ asị:
“Arụsị a m ji n’aka abaghị uru ọ bụla.”
-