-
Diuterọnọmi 3:13-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 M nyekwala ọkara ebo Manase+ ebe fọrọ na Gilied nakwa Beshan niile bụ́ alaeze Ọg. A mabu ógbè Agọb niile, nke dị na Beshan, ka ala ndị Refeyim.
14 “Jeya+ nwa Manase weere ógbè Agọb niile+ ruo n’ókè ndị Geshọ na ndị Meaka.+ Ọ kpọkwara ime ime obodo ndị dị na Beshan aha ya, ya bụ, Havọt-jeya.*+ Ha na-aza aha ahụ ruo taa. 15 M nyela Mekia Gilied.+ 16 M nyekwala ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite na Gilied ruo na Ndagwurugwu Anọn, (etiti ndagwurugwu ahụ bụ ókè ya) ruokwa Jabọk, ya bụ, ndagwurugwu nke bụ́ ókè ndị Amọn,
-
-
Diuterọnọmi 28:63Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
63 “Otú ahụ obi dị Jehova mma ime ka ihe gaziere unu nakwa ka unu mụbaa ka obi ga-adịkwa Jehova mma ibibi unu na ịla unu n’iyi. A ga-ekpochapụkwa unu n’ala ahụ unu na-aga iweghara.
-
-
Joshụa 13:8-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ọkara ebo Manase nke ọzọ na ebo Ruben nakwa ebo Gad ketara ala Mosis nyere ha n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Ebe ahụ ka Mosis ohu Jehova nyere ha.+ 9 O nyere ha malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn,+ na obodo dị n’etiti ndagwurugwu ahụ, na ala Medeba niile nke dị larịị, ruokwa Daịbọn. 10 O nyekwara ha obodo niile Saịhọn eze ndị Amọraịt si na Heshbọn na-achị, ruokwa n’ókè ala ndị Amọn.+ 11 Ọ bụkwa ha ketara Gilied na ala ndị Geshọ na nke ndị Meakat+ na ala niile dị n’Ugwu Hemọn na Beshan niile+ ruo Saleka.+ 12 Ha ketakwara ala niile dị na Beshan ebe Ọg chịrị. Ọg chịrị n’Ashtarọt nakwa n’Edraị. (O so ná ndị Refeyim ikpeazụ fọrọ ndụ.)+ Mosis meriri ha, chụpụkwa ha n’ala ha.*+
-