-
2 Ihe E Mere 5:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Mgbe ndị nchụàjà si n’ebe nsọ pụta (n’ihi na ndị nchụàjà niile nọ ebe ahụ edoola onwe ha nsọ,+ n’agbanyeghị ìgwè ha nọ),+ 12 ndị Livaị ndị nke na-abụ abụ+ yi ákwà ọma, jirikwa ájà, ụbọ akwara, na une guzoro n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụàjà ahụ. Ndị na-edu ha n’abụ ahụ bụ Esaf,+ Himan,+ Jedutọn,+ na ụmụ ha na ụmụnne ha. Ndị nchụàjà, ndị dị otu narị mmadụ na iri abụọ (120), guzokwa ebe ahụ na-afụ opi.+
-
-
2 Ihe E Mere 35:15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ụmụ Esaf, ndị na-abụ abụ,+ nọkwa ebe ha kwesịrị ịnọ, bụ́ ebe Devid, Esaf, Himan, na Jedutọn onye na-ahụrụ eze ọhụụ kwuru ka ha na-anọ.+ Ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá nọkwa n’ọnụ ụzọ ámá dị iche iche.+ Ha ahapụghị ọrụ ha n’ihi na ndị Livaị, bụ́ ụmụnne ha, kwadebeere ha anụ ndị e ji mee Ememme Ngabiga.
-