31 E nwere ndị Devid họpụtara ka ha na-eduzi ndị na-abụ abụ n’ụlọ Jehova mgbe a dọsachara Igbe Chineke n’ụlọ ahụ.+32 Tupu Solomọn arụọ ụlọ Jehova na Jeruselem,+ ọ bụ ha na-ahụ maka abụ a na-abụ n’ụlọikwuu, ya bụ, n’ụlọikwuu nzute. Ha nọkwa na-arụ ọrụ a otú a gwara ha ka ha si na-arụ ya.+
16 Devid gwakwara ndị isi ndị Livaị ka ha họpụta ụmụnne ha ndị na-abụ abụ ka ha jiri ọṅụ na-abụ abụ mgbe ngwá egwú ndị a ga na-ada: ụbọ akwara,+ une, na ájà.+
37 Devid hapụziri Esaf+ na ndị Livaị ndị ọzọ ka ha na-eje ozi mgbe niile n’ebe ahụ a dọsara igbe ọgbụgba ndụ Jehova.+ Ha na-ejekwa ozi ọ bụla e kwesịrị ije kwa ụbọchị.+
42 Himan+ na Jedutọn so ha ka ha nwee ike ịna-afụ opi, na-akụkwa ájà na ihe ndị ọzọ e ji eto ezi Chineke. Ọ bụkwa ụmụ Jedutọn+ na-eche ọnụ ụzọ ámá nche.
25Devid na ndị isi ìgwè dị iche iche na-eje ozi họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ Esaf, ụmụ Himan, na ụmụ Jedutọn+ ka ha na-eji une,+ ụbọ akwara, na ájà+ na-eto Chineke ma na-ebu amụma. Ndị a họpụtara maka ọrụ a bụ: