Ọpụpụ 14:13, 14 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Mosis wee sị ndị Izrel: “Unu atụla egwu.+ Nweenụ obi ike ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu taa.+ N’ihi na ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụ ha ọzọ.+ 14 Ọ bụ Jehova ga-alụrụ unu agha,+ ma unu ga-agba nkịtị.” Ọpụpụ 15:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Jaa* bụ ike m na ume m, n’ihi na ọ na-azọpụta m.+ Onye a bụ Chineke m. M ga-eto ya.+ Ọ bụ Chineke nke nna m,+ m ga-ajakwa ya mma.+ 1 Samuel 2:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Hana wee kpee ekpere, sị: “Jehova emeela ka obi bụrụ m sọ aṅụrị.+ Jehova enyekwuola m ike.* Ọnụ akaala m ịgwa ndị iro m okwu,N’ihi na m na-aṅụrị ọṅụ na ị zọpụtara m. 1 Ihe E Mere 16:23 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 23 Ndị niile bi n’ụwa, bụkuonụ Jehova abụ. Kwa ụbọchị, na-akọnụ otú o si azọpụta ndị mmadụ.+ Abụ Ákwá 3:26 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 26 Ọ dị mma ka mmadụ gba nkịtị*+ chere ka Jehova zọpụta ya.+
13 Mosis wee sị ndị Izrel: “Unu atụla egwu.+ Nweenụ obi ike ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu taa.+ N’ihi na ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụ ha ọzọ.+ 14 Ọ bụ Jehova ga-alụrụ unu agha,+ ma unu ga-agba nkịtị.”
2 Jaa* bụ ike m na ume m, n’ihi na ọ na-azọpụta m.+ Onye a bụ Chineke m. M ga-eto ya.+ Ọ bụ Chineke nke nna m,+ m ga-ajakwa ya mma.+
2 Hana wee kpee ekpere, sị: “Jehova emeela ka obi bụrụ m sọ aṅụrị.+ Jehova enyekwuola m ike.* Ọnụ akaala m ịgwa ndị iro m okwu,N’ihi na m na-aṅụrị ọṅụ na ị zọpụtara m.