7 Unu na ndị ezinụlọ unu ga-anọ n’ebe ahụ rie ihe n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe niile unu mere+ maka na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu.
10 Ọ sịrị ha: “Laanụ, rienụ ihe kacha mma,* ṅụọkwanụ mmanya na-atọ ụtọ, zigakwaranụ onye na-enweghị ihe ọ bụla nri.+ N’ihi na taa dị nsọ n’anya Onyenwe anyị, obi ajọkwala unu njọ n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu a rụsiri ike.”*