20 A kpụkwasịrị ihe ndị ahụ n’elu ogidi abụọ ahụ. Ha dị n’elu ihe dị gburugburu nke jikọtara ihe ahụ a kpara akpa na ogidi nke ọ bụla. N’ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi nke ọ bụla, e nwere ihe yiri mkpụrụ pomigranet dị narị abụọ (200) nke dị ahịrị abụọ gbaa gburugburu.+