13 Ọ bụ ihe na-eme ndị iberiibe+
Na ndị na-eso ha, bụ́ ndị ọnụ ha na-etu na-amasị. (Sila)
14 Ha dị ka atụrụ a ga-egbu egbu. Ha ga-aga n’ili.
Ọnwụ ga-edu ha otú onye na-azụ atụrụ si edu atụrụ ya.
Ndị ezi omume ga-achị ha+ n’ụtụtụ.
Ha agaghịzi anọ.+
Ha ga-ebizi n’ili+ kama ibi n’obí eze.+