23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge unu kụrụ mkpụrụ n’ala.+ Nri ala a ga-emepụta ga-adị mma, hiekwa nne.+ N’oge ahụ, anụ ụlọ unu ga-ata ahịhịa ná nnukwu ala ahịhịa juru.+
27 Osisi ndị dị n’ọhịa ga-amị mkpụrụ. Ala ga na-eme nri.+ Obi ga-erukwa ndị m ala n’obodo ha. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m gbajiri osisi yok+ ha ma napụta ha n’aka ndị ji ha mere ohu.