-
Ọnụ Ọgụgụ 11:31-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 Jehova wee mee ka ifufe fewe. Ifufe ahụ si n’oké osimiri na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efedata n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ Ha fedatara ruo n’ebe ga-ewe otu ụbọchị iji garuo ya ná mpaghara niile, gbaa gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. Ha juru n’ala ruo ihe dị ka kubit* abụọ n’ịdị elu. 32 N’ihi ya, n’ehihie ụbọchị ahụ niile na n’abalị ya niile nakwa n’echi ya niile, ndị Izrel nọ na-anwụrụ nnụnụ kwel. E nweghị onye nwụtara nnụnụ kwel na-agaghị eju homa* iri. Ha nọ na-awụsara onwe ha nnụnụ ahụ gburugburu ebe niile ha mara ụlọikwuu.* 33 Ma mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ, tupu ha ataa ya, Jehova wesara ha ezigbo iwe. Jehova wee gbuwe ọtụtụ n’ime ha.+
34 Ha wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+
-