-
Ọnụ Ọgụgụ 14:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a. 3 Gịnị mere Jehova ji akpọta anyị n’ala a ka e jiri mma agha gbuo anyị?+ A ga-akpọkọrọ ndị nwunye anyị na ụmụ anyị.+ Ọ́ kaghị mma ka anyị laghachi n’Ijipt?”+ 4 Ha nọ na-agwadị ibe ha, sị: “Ka anyị mee otu onye onye ndú anyị ma laghachi n’Ijipt!”+
-
-
1 Ndị Kọrịnt 10:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ka anyị gharakwa ịkwa iko* otú ụfọdụ n’ime ha kwara, nke mere ka puku iri abụọ na puku atọ (23,000) n’ime ha nwụọ n’otu ụbọchị.+ 9 Ka anyị gharakwa ịnwa Jehova*+ otú ụfọdụ n’ime ha nwara ya, nke mere ka agwọ tagbusịa ha.+ 10 Unu atamukwala ntamu otú ụfọdụ n’ime ha tamuru,+ mmụọ ozi* alaa ha n’iyi.+
-