-
1 Timoti 5:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ka nwaanyị dị afọ iri isii gbagowe, nke di ya nwụrụ, soro ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa. Ọ ga-abụkwa onye na-agbaghị n’èzí mgbe di ya nọ ndụ.* 10 O kwesịkwara ịbụ onye e ji ịrụ ọrụ ọma mara,+ onye zụrụ ụmụ ya nke ọma,+ onye lere ọbịa,+ onye sara ụkwụ ndị nsọ,+ onye nyeere ndị nọ n’ahụhụ aka,+ onye jikwa ụdị ọrụ ọma niile kpọrọ ihe.
-
-
Taịtọs 2:3-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ka ndị agadi nwaanyị na-akpa àgwà gosiri na ha na-asọpụrụ Chineke, ghara ịna-ekwutọ ndị ọzọ, ghara ịna-aṅụ oké mmanya, ka ha na-akụzi ihe dị mma, 4 ka ha wee na-adụ ụmụ nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ọdụ* ka ha hụ di ha n’anya, ka ha hụ ụmụ ha n’anya, 5 ka ha na-ele ihe anya otú dị mma, dị ọcha, na-arụ ọrụ n’ụlọ,* bụrụ ndị ezigbo mmadụ, ndị na-erubere di ha isi,+ ka a ghara ịkatọ okwu Chineke.
-