16 Ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla bụ́ Onye Kraịst nwere ndị ikwu bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ya nyere ha aka, ka ọgbakọ ghara ibu ibu ha. Ọ ga-eme ka ọgbakọ nwee ike ịna-enyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ ná mkpa aka.*+
27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+