-
Joshụa 7:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Joshụa na ndị Izrel niile wee kpọrọ Ekan+ nwa Zira, chịrịkwa ọlaọcha ahụ na ọmarịcha uwe ahụ na mkpirisi ọlaedo ahụ,+ kpọrọkwa ụmụ ya ndị nwoke na ụmụ ya ndị nwaanyị, kpụrụkwa ehi ya na jakị ya na ìgwè ewu na atụrụ ya, burukwa ụlọikwuu ya na ihe ya niile, rute na Ndagwurugwu Ekọ.+ 25 Joshụa wee sị ya: “Gịnị mere i ji kpatara anyị ọdachi?*+ Jehova ga-akpatakwara gị ọdachi taa.” Ndị Izrel niile wee tụọ ha nkume,+ mechaakwa gbaa ha ọkụ.+ Otú a ka e si jiri nkume tụgbuo ha niile.
-
-
Esta 9:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 N’ihi na Heman+ nwa Hamedeta, onye agbụrụ Egag,+ onye iro ndị Juu niile, kpara nkata ibibi ndị Juu.+ O fekwara Pua,+ ya bụ, Nza, iji mee ka ụjọ jide ha nakwa iji bibie ha. 25 Ma mgbe Esta gakwuuru eze, eze nyere iwu, e deekwa ya edee,+ sị: “Ka nkata ọjọọ a ọ kpaara ndị Juu+ kpudo ya.” Ha kwụwakwara ya na ụmụ ya n’elu osisi.+
-