16 N’ihi ya, na-ekwupụtaranụ ibe unu mmehie unu,+ na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.+
21 Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na obi anyị anaghị ama anyị ikpe, obi ga-esi anyị ike ịgwa Chineke okwu.+22 Anyị na-enweta ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya+ maka na anyị na-eme ihe o nyere n’iwu, na-emekwa ihe dị mma n’anya ya.