12 Ònye n’ime unu ka ndụ na-atọ ụtọ,
Nke chọkwara ịdị ogologo ndụ ma na-enwe obi ụtọ?+
נ [Nun]
13 Ya ejila ọnụ ya kwuo ihe ọjọọ+
Ma ọ bụ jiri ya na-aghọ aghụghọ.+
ס [Samek]
14 Ya hapụ ihe ọjọọ, mewe ezi ihe.+
Ya na-achọ udo ma gbalịa na-eme udo.+
ע [Ayin]
15 Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+
Ntị ya na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.+
פ [Pee]
16 Ma Jehova na-ajụ ndị na-eme ihe ọjọọ,
Ka e wee bibie ha, a gharazie icheta ha n’ụwa.+