-
Abụ Ọma 115:4-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị ha na-efe.
Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+
5 Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+
Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.
6 Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe.
Ha nwere imi, ma ha anaghị anụ ísì.
7 Ha nwere aka, ma ha anaghị emetụ ihe aka.
Ha nwere ụkwụ, ma ha anaghị aga ije.+
Ha anaghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ ọ bụla.+
-