10 Mkpanaka eze agaghị apụ apụ na Juda,+ mkpara onye na-achị achị agaghịkwa apụ n’agbata ụkwụ ya, ruo mgbe Shaịlo* ga-abịa.+ Ọ* bụ ya ka mba dị iche iche ga-erubere isi.+
32 Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu.+ Jehova* bụ́ Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid.+33 Ọ ga-achị ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+