Aịzaya 60:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 A gaghịzi anụ gbasara tigbuo zọgbuo n’ala gị. E nweghịzikwa ebe a ga-anụ gbasara imebisị ihe ndị mmadụ na ibibi ihe ndị mmadụ n’ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto. Aịzaya 65:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya,Ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya. N’ihi na ndị m ga-anọ ogologo ndụ otú osisi si anọ.+ Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju. Jeremaya 23:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 N’oge ọ ga na-achị, a ga-azọpụta Juda.+ Obi ga-erukwa ndị Izrel ala n’ebe ha bi.+ Aha a ga na-akpọ ya bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.”+ Ezikiel 34:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo.+ M ga-emekwa ka anụ ọhịa ọjọọ gharazie ịdị n’ala ha.+ Ihe a ga-eme ka obi na-eru ha ala n’ala ịkpa ha bi, ha ana-ehikwa ụra n’oké ọhịa.+ Hosia 2:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 N’ụbọchị ahụ, mụ na anụ ọhịa ga-agba ndụ maka ha,+Mụ na nnụnụ na ihe ndị na-arị arị* ga-agbakwa ndụ maka ha.+ M ga-ewepụ ụta na mma agha na agha n’ala ha.+ Meekwa ka obi ruo ha ala ma ha dinara ala.+
18 A gaghịzi anụ gbasara tigbuo zọgbuo n’ala gị. E nweghịzikwa ebe a ga-anụ gbasara imebisị ihe ndị mmadụ na ibibi ihe ndị mmadụ n’ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.
22 Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya,Ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya. N’ihi na ndị m ga-anọ ogologo ndụ otú osisi si anọ.+ Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.
6 N’oge ọ ga na-achị, a ga-azọpụta Juda.+ Obi ga-erukwa ndị Izrel ala n’ebe ha bi.+ Aha a ga na-akpọ ya bụ: Jehova Mere Ka Anyị Bụrụ Ndị Ezi Omume.”+
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo.+ M ga-emekwa ka anụ ọhịa ọjọọ gharazie ịdị n’ala ha.+ Ihe a ga-eme ka obi na-eru ha ala n’ala ịkpa ha bi, ha ana-ehikwa ụra n’oké ọhịa.+
18 N’ụbọchị ahụ, mụ na anụ ọhịa ga-agba ndụ maka ha,+Mụ na nnụnụ na ihe ndị na-arị arị* ga-agbakwa ndụ maka ha.+ M ga-ewepụ ụta na mma agha na agha n’ala ha.+ Meekwa ka obi ruo ha ala ma ha dinara ala.+