27 ‘Ma gịnwa bụ́ Jekọb ohu m, atụla egwu.
Izrel, atụkwala ụjọ.+
N’ihi na m ga-esi ebe dị anya zọpụta gị,
Zọpụtakwa ụmụ gị n’ala a dọọrọ ha n’agha laa.+
Jekọb ga-alọta. Ahụ́ ga-erukwa ya ala. E nweghị ihe ga-enye ya nsogbu.
E nweghịkwa onye ga-emenye ya ụjọ.’+