-
Ezikiel 25:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ndị Ịdọm ataala ndị Juda ahụhụ, meekwa ezigbo ihe ọjọọ, n’ihi na ha gara megwara ndị Juda ihe ha mere ha.+ 13 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-eweli aka m mee ndị Ịdọm ihe. M ga-egbu ma mmadụ ma anụ ụlọ. M ga-emekwa ka obodo ha tọgbọrọ nkịtị.+ Malite na Timan ruo Didan, a ga-eji mma agha bibie ha.+
-
-
Ezikiel 36:5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ha, sị: ‘M ga-eji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi+ kwuo ihe ga-eme ndị fọdụrụ ná mba dị iche iche nakwa ihe ga-eme ndị Ịdọm niile. Ha niile na-akwa m emo. Obi bụkwa ha sọ aṅụrị+ ka ha na-eweghara ala m. Ha na-achọkwa iweghara ebe dị iche iche anụmanụ na-ata ahịhịa na ya, na-achọkwa ịkwakọrọ ihe ndị dị n’ala m.’”’+
-