-
Ezikiel 46:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 N’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-esi n’ìgwè ehi weta obere oké ehi ahụ́ dị mma, obere ebule isii na otu nnukwu ebule. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 7 Ọ ga-ewetakwa otu efa ntụ ọka maka obere oké ehi na otu efa ntụ ọka maka ebule nakwa ntụ ọka ole ọ ga-ewetali maka obere ebule ndị ahụ iji chụọ àjà ọka. Mmanụ ọ ga-eweta ga-abụ otu hin maka otu efa ntụ ọka.
-