13 Ma onyeisi+ alaeze Peshia nọchiiri m ụzọ ruo ụbọchị iri abụọ na otu. Ma Maịkel,*+ otu n’ime ndị isi kachanụ, bịara inyere m aka. M nọkwa n’ebe ahụ n’akụkụ ndị eze Peshia.
9 Ma mgbe Maịkel+ onyeisi ndị mmụọ ozi+ na Ekwensu sere okwu ma na-arụ ụka banyere ozu Mosis,+ e nweghị mgbe ọ mara Ekwensu ikpe, ọ gwaghịkwa ya okwu ọjọọ,+ kama ọ sịrị: “Ka Jehova* baara gị mba.”+
7 Agha dakwara n’eluigwe: Maịkel*+ na ndị mmụọ ozi ya lụsoro dragọn ahụ agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya lụsokwara ha agha. 8 Ma, e meriri dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya,* nke na e nweghịzi ebe ha ga-anọ n’eluigwe.