-
Diuterọnọmi 8:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ọ bụrụ na unu asị n’obi unu, ‘Ọ bụ ike anyị na ọkpụkpụ aka anyị ka anyị ji kpatara onwe anyị akụ̀ ndị a,’+ 18 chetanụ na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ike unu ji akpata akụ̀,+ ka o wee mezuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara, otú ọ na-eme taa.+
19 “Ọ bụrụ na unu anwaa anwaa chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, wee soro chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+
-