Diuterọnọmi 2:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu n’ihe niile unu merela. Ọ ma nnọọ otú unu si na-agagharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu afọ iri anọ a, e nweghịkwa ihe kọrọ unu.”’+ Diuterọnọmi 32:9, 10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 9 N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya.+ Ọ bụ Jekọb ka o ketara.+ 10 Ọ hụrụ ya n’ala ịkpa,+N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụ ọhịa na-agbọ ụja na ya.+ Ọ gbara ya gburugburu ma lekọta ya,+Chebekwa ya ka mkpụrụ anya ya.+
7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu n’ihe niile unu merela. Ọ ma nnọọ otú unu si na-agagharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu afọ iri anọ a, e nweghịkwa ihe kọrọ unu.”’+
9 N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya.+ Ọ bụ Jekọb ka o ketara.+ 10 Ọ hụrụ ya n’ala ịkpa,+N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụ ọhịa na-agbọ ụja na ya.+ Ọ gbara ya gburugburu ma lekọta ya,+Chebekwa ya ka mkpụrụ anya ya.+