9 Ma unu bụ “ndị a họọrọ, ndị eze bụ́kwa ndị nchụàjà, mba dị nsọ,+ ndị pụrụ iche Chineke họọrọ,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile na Chineke dị mma.”+ Ọ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ma kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+
12 Na-akpanụ àgwà dị mma mgbe unu na ndị mba ọzọ nọ,+ ka ọ ga-abụ, ha na-asịgodị na unu bụ ndị ọjọọ, ha enwee ike ịhụ ihe dị mma unu na-eme+ wee too Chineke n’oge ọ ga-enyocha ndị mmadụ.