-
Mak 7:25-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ozugbo ahụ, otu nwaanyị nke mmụọ ọjọọ* ji obere nwa ya nwaanyị nụrụ banyere Jizọs ma bịa daa n’ala n’ụkwụ ya.+ 26 Nwaanyị ahụ bụ onye Grik, onye si n’obodo Finishia dị na Siria.* O wee na-arịọ Jizọs ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’ahụ́ nwa ya nwaanyị. 27 Ma Jizọs sịrị ya: “Ka ụmụaka buru ụzọ rijuo afọ n’ihi na e kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.”+ 28 Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: “Ee, nna anyị ukwu. Ma, ụmụ nkịta ndị nọ n’okpuru tebụl na-eri iberibe ihe ndị si ná nri ụmụaka dapụ.” 29 Jizọs wee sị ya: “Ebe i kwuru ihe a, lawa. Mmụọ ọjọọ ahụ apụọla n’ahụ́ nwa gị nwaanyị.”+ 30 O wee laa n’ụlọ ya ma hụ nwatakịrị ahụ ka o dina n’àkwà.* Mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla ya.+
-