21 Malite n’oge ahụ gawa, Jizọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem nakwa na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ata ya ezigbo ahụhụ ebe ahụ. A ga-egbukwa ya, ma, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.+
31 N’ihi na ọ nọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe, na-asị ha: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ, ha ga-egbukwa ya.+ Ma n’agbanyeghị na a ga-egbu ya, ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”*+