Matiu 18:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 N’ihi ya, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kacha n’Alaeze eluigwe.+ Matiu 23:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Ma onye kacha ukwuu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ Mak 10:43, 44 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 43 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ. Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 44 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu niile. Luk 22:26 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 26 Ma, unu ekwesịghị ịdị otú ahụ.+ Kama ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta,+ ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi.
43 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ. Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 44 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu niile.
26 Ma, unu ekwesịghị ịdị otú ahụ.+ Kama ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta,+ ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi.