-
Luk 9:46-48Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
46 Ha wee malite ise okwu, na-azọ onye ọ bụ ya kacha ukwuu n’ime ha.+ 47 Ebe Jizọs ma ihe ha na-eche n’obi ha, ọ kpọrọ otu nwatakịrị, gwa ya ka o guzoro n’akụkụ ya, 48 wee sị ha: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m. Onye ọ bụla nke na-anabata m na-anabatakwa onye zitere m.+ N’ihi na onye na-eme onwe ya ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”+
-