-
Mak 10:46-52Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
46 Ha wee bata Jeriko. Ma mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ buru ibu si na Jeriko na-apụ, Batimiọs (nwa Timiọs), onye arịrịọ nke kpuru ìsì, nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ.+ 47 Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jizọs onye Nazaret na-agafe, ọ malitere iti mkpu, sị: “Jizọs, nwa Devid,+ meere m ebere!”+ 48 Ọtụtụ ndị malitere ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ. Ma, ọ nọ na-etisikwu mkpu ike, sị: “Nwa Devid, meere m ebere!” 49 Jizọs kwụsịrị, sị: “Kpọọrọnụ m ya.” Ha wee kpọọ nwoke ahụ kpuru ìsì, sị ya: “Nwee obi ike. Bilie, ọ na-akpọ gị.” 50 O yipụrụ uwe elu ya, malie ma gakwuru Jizọs. 51 Jizọs wee sị ya: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Nwoke ahụ kpuru ìsì sịrị ya: “Rabonaị,* mee ka m hụwa ụzọ.” 52 Jizọs sịziri ya: “Lawa, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Ozugbo ahụ, ọ hụwara ụzọ.+ O wee soro Jizọs gawa.
-
-
Luk 18:35-43Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
35 Ma ka Jizọs na-eru Jeriko nso, otu onye ìsì nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.+ 36 Mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ìgwè mmadụ na-agafe, ọ malitere ịjụ ihe na-eme. 37 Ha asị ya: “Jizọs onye Nazaret na-agafe.” 38 O wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Nwa Devid, meere m ebere!” 39 Ndị nọ ya n’ihu wee malite ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọ na-etisikwu mkpu ike, sị: “Nwa Devid, meere m ebere!” 40 Jizọs wee kwụsị ma sị ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, Jizọs jụrụ ya, sị: 41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ya asị: “Onyenwe anyị, mee ka m hụwa ụzọ.” 42 N’ihi ya, Jizọs sịrị ya: “Hụwa ụzọ. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ 43 O wee hụwa ụzọ ozugbo. Ọ malitekwara iso ya,+ na-eto Chineke. Mgbe ndị ahụ niile hụrụ ihe merenụ, ha toro Chineke.+
-