Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mak 14:66-72
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 66 Mgbe Pita nọ n’ala na mbara èzí, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị na-ejere nnukwu onye nchụàjà ozi bịara.+ 67 Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, o legidere ya anya, sị: “Gị na onye Nazaret a, bụ́ Jizọs, na-anọ.” 68 Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Amaghị m onye ọ bụ, aghọtaghịkwa m ihe ị na-ekwu.” O wee pụọ gaa n’ebe ọnụ ụzọ ámá.* 69 Nwa agbọghọ ahụ na-eje ozi hụrụ ya n’ebe ahụ, malitekwa ịsị ndị guzo n’akụkụ: “Onye a bụ otu n’ime ha.” 70 Ọ gọrọ agọ ọzọ. Mgbe obere oge gachara, ndị guzo n’akụkụ malitere ịgwa Pita ọzọ, sị: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, ị bụ onye Galili.” 71 Ma ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, sị: “Amaghị m onye a unu na-ekwu okwu ya.” 72 Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara nke ugboro abụọ.+ Pita wee cheta na Jizọs gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa ugboro abụọ, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ N’ihi ya, o jidelighị onwe ya. O wee bewe ákwá.

  • Luk 22:54-62
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 54 Ha wee jide ya, kpụrụ ya pụọ,+ kpụbata ya n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà. Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ha.+ 55 Mgbe ha kwanyere ọkụ n’etiti mbara èzí wee nọdụ ala, Pita sokwa ha nọrọ ọdụ ebe ahụ.+ 56 Ma otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ hụrụ ya ka ọ nọ ọdụ n’akụkụ ọkụ ahụ, wee leruo ya anya, sị: “Ya na nwoke a na-anọkwa.” 57 Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Nwaanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58 Mgbe obere oge gara, onye ọzọ hụrụ ya ma sị: “Ị bụkwa otu n’ime ha.” Ma Pita sịrị: “Nwoke m, ọ bụghị eziokwu.”+ 59 Mgbe ihe dị ka otu awa gara, nwoke ọzọ malitere ikwusi ike, sị: “O doro m anya na ya na nwoke a na-anọ, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ onye Galili!” 60 Ma Pita sịrị: “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu.” N’otu ntabi anya, ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, oké ọkpa kwara. 61 Onyenwe anyị tụgharịziri legide Pita anya, Pita echeta okwu Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 62 O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.

  • Jọn 18:15-17
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 15 Saịmọn Pita nọ na-eso Jizọs, ya na onye ọzọ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs.+ Nnukwu onye nchụàjà ma onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Onye ahụ sooro Jizọs banye na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà. 16 Ma Pita guzo n’èzí n’ọnụ ụzọ. Onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye nnukwu onye nchụàjà ma, gara gwa onye nche ọnụ ụzọ okwu wee kpọbata Pita. 17 Nwa agbọghọ na-eje ozi, onye na-eche ọnụ ụzọ ahụ nche, sịrị Pita: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ nwoke a?” O wee sị: “Esoghị m.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya