-
Jọn 18:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Saịmọn Pita guzo na-anya ọkụ. Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ na i soghị ná ndị na-eso ụzọ ya?” Ọ gọrọ agọ, sị: “Esoghị m.”+ 26 Otu n’ime ndị ohu nnukwu onye nchụàjà, bụ́ onye ikwu nwoke ahụ Pita bepụrụ ntị,+ sịrị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?” 27 Ma Pita gọrọ agọ ọzọ. Ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara.+
-