-
Luk 8:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 “O nweghị onye na-amụnye ọkụ* were ihe kpuchie ya ma ọ bụ dọsa ya n’okpuru àkwà.* Kama, ọ na-adọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ, ka ọ na-enwuru ndị na-abata n’ụlọ.+ 17 N’ihi na e nweghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè. E nweghịkwa ihe ọ bụla e kpuchiri nke ọma nke a na-agaghị amata, nke na-agaghịkwa apụta ìhè.+
-